
Achịbịshọpụ ụka Anglịkan nke Dayọsis Enugu bụ Bịshọpụ Emmanuel Chukwuma akọwaala ihe mere o jiri degara mba Briten akwụkwọ mkpesa nke rịọrọ ka e mere Sịnetọ Ike Ekweremadu ebere n’ikpe ya tupu ikpe a maa ya.
Bịshọp Chukwuma kwuru nke a na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere na nso nso a dịka ọkaikpe Justice Johnson kpọpụtara aha ya n’ụbọchị ise nke ọnwa Mee, 2023 bụ ụbọchị a mara Sịnetọ Ike Ekweremadu ikpe na mba Briten.

Ndị uweojii mba UK chọburu ka a tụọ Ekwermadu, nwunye ya bụ Beatrice Ekweremadu na Obinna Obeta mkpọrọ ga-eru afọ 18 mana ọkaikpe kere ikpe a kọwara na mkpesa ọ natara nke aha Bịshọpụ Chukwuma nọ n’ime ya so mee e beleta ntaramahụhụ e nyere Ekweremadu.
E jidere Ekweremadu na nwunye ya n’UK n’ụbọchị 23 nke ọnwa Juun 2022 maka ebubo ịtụ mgbere ihe ahụ mmadụ.
E mechara maa Ekweremadu, nwunye ya bụ Beatrice, na otu dọkịta aha ya bụ Obinna Obeta, ikpe n’ụbọchị Fraịde, bụ ụbọchị ise nke ọnwa Mee, maka okwu ịgba ohu ọgbara ọhụrụ nakwa ịtụ mgbere akụkụ ahụ mmadụ.

Dịka ọkaikpe Johnson nọ na-ama Ekweremadu ikpe, o kwuru:
“N’oge ikpe gị, anyị natara ọtụtụ ozi igba ịma banyere akparaagwa gị nke gụnyere ozi Bịshọp Emmanuel Chukwuma bụ Achịbịshọpụ Dayọsis Enugu.”
“A natala m akwụkwọ nchịkọta ya ruru 51 nke gbara ama maka ezi agwa gị, agụọla m ha niile nke gụnyere akwụkwọ onye bụbu Onyeisiala Naịjirịa (Olusegun Obasanjo), onyeisi ụlọomeiwu Naijirịa ugbua, Bịshọpụ Enugu, ọkaiwu gọọmentị Naijirịa nakwa onyeisi ụlọomeiwu nta Naijirịa zitere.”

“A chịkọtara m ihe niile nke mere e ji belata ntaramahụhụ gị… Nke mere e ji enye gị ntaramahụhụ ịga nga ruo afọ itoolu na ọnwa asatọ.”
Bịshọpụ Chukwuma gwara BBC Igbo na o zigara ozi ahụ Briten n’ihi na ọ ma na Ekweremadu abụghị ajọ mmadụ. Ọ kọwara na ya onwe ya ọ bụ onye nlekọta ya n’ụka ma kọwa na ọ ma ya dịka onye na-agbatara ndị obenye, ndị ajadụ, ndị ntorobịa nakwa ndị ụwa na-atụ n’ọnụ ọsọ enyemaka.
N’okwu ya, ọ sị:
“Ama m ya malite mgbe ọ rụrụ ọrụ dịka onyeisioche okpuruoọchịchị ya ruo mgbe ọ rụrụ ọrụ dịka onyeisi ndị ọrụ ma rukwa mgbe ọ banyere n’ụlọomeiwu.”
O kwuru na ọ ma mgbe Ekweremadu hibere ụlọọrụ na-enyere ndị mmadụ aka nke aha ya bụ Ikeoha foundation, ma kọwa na ya bụ nwaamadị bụ onye e kwesịrị ịgbara ezi ama.
“E zigara m ozi ahụ ka a ghara ịta ya ahụhụ dịka onye omekome n’ihi na a ma m na ọ bụ ezigbo mmadụ, onye hụrụ Chukwu n’anya ma na-agbachitere ndị ogbenye.”
“Ahụbeghị ebe o gburu mmadụ maọbụ mejọọ onye ọbụla.”

Bịshọpụ Chukwuma kwukwara na Ekweremadu bụ ezi onye ụka Anglịkan nke rụrụla otu ụka ma bụrụ onye na-aga n’otu ụka nke ya onwe ya na-elekọta.
“Ọ bụghị onye otu nzuzo, ọ rụrụ otu ụlọụka, gọmyekwa ọtụtụ ụlọụka ụgbọala bọọsụ ma kwụkwa ụgwụ njem ụfọdụ ndị mmadụ ji gaa ala nsọ Israel.”
O gakwara n’ihu gbaa ama ọrụ ọma ya dịka onye ndọrọndọrọ ọchịchị ma kwuo:
“Ọ welatara ọtụtụ ọrụ ọma na mpaghara ‘Senatorial zone’ ya.”
“Ọ mepere ụlọakwụkwọ ebe a na-akụziri ndị okenye nkuzi.”
Bịshọpụ Chukwuma kwukwara na ọ ma na Ekweremadu bụ onye hụrụ ezinaụlọ ya n’anya nke ukwu nke bụ na ihe mere bụ iji zoo ndụ nwaa ya nakwa na ọbụghị iji megidi nwata nwoke a sị ọ chọrọ izu akịrị ya.
‘Ọchịchị Naijirịa emeghi ihe ha kwesiri iji gbachitere Ekweremadu’
Bịshọpụ Chukwuma rụkwara Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari aka na mkparịtaụka a ma kwuo:
“Ọ bụ ihe mwute na onye ji ndụ ya gbaara Naịjirịa odibo ogologo afọ anataghị ozi mgbachi ọbụla n’aka onyeisiala nakwa minista na-ahụ maka mba na mba.”
O kwuru na nke kacha njọ bụ na minista Naịjirịa na-ahụ maka mmekọ mba na mba (Geoffrey Onyeama) bụ onye Enugu steeti dịka Ekweremadu nke bụ na ọ che na ọ ga-eme ka ọ tinye ọnụ.
Bịshọpụ Chukwuma kwuru na ebe obi ụtọ ya nọ bụ na ozi ha zigaara mba Briten mịtara mkpụrụ dịka a na-atụ anya na ndị ọkaiwu ya nwereike ịgbagha ikpe ahụ maọbụ ọchịchị Eze na ezinaụlọ ya ezipụta ozi ebere maka okwu Ekweremadu maọbụkwanụ, aka Chukwu emepere Ekweremadu ụzọ ntọhapụ.

Agbanyeghi na ọkaikpe kpere ikpe a gụpụtara ụfọdụ ihe ọma ndị a nke Bịshọpụ Chukwuma gbara n’ama maka ya, ọkaikpe Johnson gara n’ihu kwuo na:
- Ekweremadu ma nke ọma na nwata nwoke ahụ bụ nwata ma bụrụkwa onye ụbịam
- Ekweremadu ma nke ọma ọnọdọ ọjọọ ụbịam na-edebe ndị mmadụ n’ihi na o hibere ụlọọrụ nke o kwuru na o ji enyere ndị ogbenye aka
- Oge Ekweremadu chọpụtara na akụrụ nwata nwoke ahụ adabeghị na nke nwa ya nwaanyị, ọ malitere ịchọ onye ọzọ ọ ga-ejikwa mee otu ihe ahụ
- Ekweremadu achọtalarị ọtụtụ ndị mmadụ bụ ndị ọ ga-esi n’ime ha nweta onye ọzọ ga-enye nwa ya nwaanyị akụrụ
- Ekweremadu n’onwe ya nwekwara ọrịa nke ọ na-arịa
- Ụlọikpe ọbụla amabeghị Ekweremadu ikpe mbụ
- Ekweremadu mere ihe a n’ihi ọnọdụ ahụike ọjọọ nke nwa ya nwaanyị nọ n’ime ya
- Ekweremadu gaara achọ onye ọzọ ga-enye nwa ya nwaanyị onyinye akụrụ, na-abụghị onye a ga-akwụ ụgwọ, ọ bụladị site na ndị ezinụlọ ya.
(BBC News Igbo)









